Ihe onye metara
ọ si na onye ọzọ mere ya;
Ọ katọro gi akatọ, bo gi ebubo
Uru ọtutu di ya, n'ọsọ ọjọọ niile ọ gbara
Dị ka mgbe ụbọchị mebere ya amara.
:
:
ọ bụ nkịta, ọ naghị erizi
Nshi nke ya kamakwa ọ lie ya eli
Egbe di ya n'aka, nku dikwa ya n'ukwu
O jizi efe n'elu, mgbe chi obula jiziri eji
Ọ dị ndụ igbu ma gbuokwa ka ọ wee dị ndụ.
:
:
Nanị onye nzuzu na-alụrụ ọgụ nye obodo ya,
Eze nke na-chere ka chi jiri tupu o puwa ije
n'ihi na abum-ọnu adịghị ebiri n'elu osisi
Onye akpu-obi n'okpuru nkuchi muọnwu
Chefuru onye na-ahụ site na nkpuchi.
:
:
Ọnya nọ n'ụkwụ agụ,
Emewo ka agụrụ dakwasị ya.
Ugbu a ọ na-arịọ otu nde arịrịọ
Na-nuọkwaiyi, nakwa otu narị ekpere
Ma kwuo si - bikonu, nke a bụ nke mbụ m ge'me! .
Ihe Onye Metara
Adebayo Sir Toby
(C) All Rights Reserved. Poem Submitted on 05/23/2020
(1)
Poem topics: , Print This Poem , Rhyme Scheme
About Ihe Onye Metara
Ihe Onye Metara is a poem by Adebayo Sir Toby. This page includes the poem text, poet information, related topics, comments, and similar poems.
Write your comment about Ihe Onye Metara poem by Adebayo Sir Toby
Best Poems of Adebayo Sir Toby
