Ihe onye metara
ọ si na onye ọzọ mere ya;
Ọ katọro gi akatọ, bo gi ebubo
Uru ọtutu di ya, n'ọsọ ọjọọ niile ọ gbara
Dị ka mgbe ụbọchị mebere ya amara.

:
:
ọ bụ nkịta, ọ naghị erizi
Nshi nke ya kamakwa ọ lie ya eli
Egbe di ya n'aka, nku dikwa ya n'ukwu
O jizi efe n'elu, mgbe chi obula jiziri eji
Ọ dị ndụ igbu ma gbuokwa ka ọ wee dị ndụ.
:
:

Nanị onye nzuzu na-alụrụ ọgụ nye obodo ya,
Eze nke na-chere ka chi jiri tupu o puwa ije
n'ihi na abum-ọnu adịghị ebiri n'elu osisi
Onye akpu-obi n'okpuru nkuchi muọnwu
Chefuru onye na-ahụ site na nkpuchi.
:
:

Ọnya nọ n'ụkwụ agụ,
Emewo ka agụrụ dakwasị ya.
Ugbu a ọ na-arịọ otu nde arịrịọ
Na-nuọkwaiyi, nakwa otu narị ekpere
Ma kwuo si - bikonu, nke a bụ nke mbụ m ge'me! .